USORO NJỤAJỤJỤ NA AJỤJỤ N’ OLU NZỤ NA IGBO IZUGBE: NDEKỌ NTỤLEKỌRỊTA (INTERROGATIVE STRUCTURES AND QUESTION FORMATION IN THE NSỤ DIALECT AND STANDARD IGBO: A COMPARATIVE DOCUMENTATION)
Authors: Chuks Favour Demson & Gloria Nkiru Egwuonwu-Chimezie
Publication Details
Published: July 28, 2026
Reference: Volume 9, Issue 2
Abstract
Njụajụjụ bụ usorookwu maọbụ mkpụrụokwu ọrụ ya bụ ịjụ ajụjụ. E lebara anya n’usoro ịjụ ajụjụ n’olundị Nsụ na Igbo Izugbe na nchọcha a, iji mara myiri na ndịiche dị n'usoro mmebeokwu na usorookwu ha. Asụsụ Igbo nwere ọtụtụ olundị nke mere ka a na-enwe ndịtụiche n'ọdịdị mkpụrụokwu nakwa n'usorookwu n’etiti olundị ndị a, na Igbo izugbe. A gbasoro usoro nkọwasị wee mee nchọcha a site n'iji atụtụ usoro nnyocha adịmiche. E jiri ndị na-asụ olundị Nsụ ka olu epum ha mee nchọcha a, tinyere ihe ndị e nwetara site n'ajụjụ, azịza nakwa mkparịtaụka anyị na ndị e ji mee nchọcha nwere. Ọ bụladị ihe ndị a gụtara n'akwụkwọ dị icheiche e dere gbasara isiokwu nchọcha a, na o yiri ya socha, tinyekwara ihe ndị omenchọcha maara banyere isiokwu dịka ndị na-asụ asụsụ Igbo ka asụsụ epum ha. A chọpụtara na e nwetụrụ ndịiche na-etu e si edepụta njụajụjụ n'olundị Nsụ na Igbo Izugbe. Ajụjụ chọrọ ọsịsa ''ee'' na ''mba'' na-esite n'ahịrịnkwusa. Ahịrịnkwusa nwere ike ịbụ ahịrịajụjụ site na mgbanwe ụdaolu. Nke a na-adị ire mgbe a na-esi n’ahịrịnkwụsa nke isiahịrị ya bụ aha maọbụ nkebiokwu keaha enwete ajụjụ site n’itinye nnọchiaha ga-anọdebe isiahịrị nso. N’aka nke ọzọ, a na-agbanwo ụdaelu ka ọ bụrụ ụdaala mgbe isiahịrị bụ nnọchiaha. Njụajụjụ nwere ike ịmalite ahịrịokwu ma ọ bụrụ ma e mee ka ọ rụọ ọrụ nrụmaka (focusing). 'kedụ' anaghị anabata mbugharị dịka njụajụjụ ndị ọzọ.
Full Text (PDF)
Preview:
How to Cite
Chuks Favour Demson & Gloria Nkiru Egwuonwu-Chimezie. (2026). USORO NJỤAJỤJỤ NA AJỤJỤ N’ OLU NZỤ NA IGBO IZUGBE: NDEKỌ NTỤLEKỌRỊTA (INTERROGATIVE STRUCTURES AND QUESTION FORMATION IN THE NSỤ DIALECT AND STANDARD IGBO: A COMPARATIVE DOCUMENTATION). ABIA JOURNAL OF HUMANITIES , Volume 9 (2) .